Number of Pages: 69

File Size: 139 KB

File Type: MS Word & PDF

Chapters: 1 - 5

5,000.00

UMI EDEMEDE
Asusu obula di n’uwa nwere olundi e jiri mara ya. Asusu Igbo, dika
otu n’ime asusu ato e nwere na Naijiria nwere olundi di iche iche ma
nwekwaa Igbo Izugbe e jiri mara obodo niile na-asu asusu Igbo.
N’edemede nchocha a nke isi okwu ya bu Ntulerikota olundi Achi na
nke Igbo Izugbe, e lebara anya n’olundi Achi iji choputa myiri na
ndiiche di n’etiti ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha malitere site n’inye
nkowa banyere ebe isiokwu a gbadoro ukwu. E nyere nkowa
banyere olundi na Igbo Izugbe putara. A kowakwara abumnobi
nchocha a nke gunyere ikwalite asusu Igbo. E metutakwara aka
n’uru di iche iche nchocha a baara nwanchocha, umuakwukwo,
ndinkuzi ndi ga-agu ya n’odinihu na ndi ga-eme nchocha nay a
tinyere ndi nwere mmasi n’asusu Igbo. Nihi na nchocha nke e mere
bu nke sovee, nwanchocha gara n’ogbe iri na abuo di n’Achi gbaa ndi
okenye ajuju onu. E kere ndi maara aguede akwukwo ajuju nke ha
zakwara. A kowakwara maka okere nchocha ebe a noro kowaputa
na o bu naani Igbo a suru asu ka agbadokariri ukwu ihi choputa ihe
6
digasi mkpa banyere olundi Achi. E deputakwara ajuju niile a juru
ndi e jiri mee nchocha kesaa ha nye ndi nwere ike igu ha dika nid
nkuzi na umuakwukwo. E ziputakwara otutu nnyocha ihe e derela
banyere isiokwu nakwa nnyocha edemede nchoputa bu ndi e sitere
n’akwukwo agumagu di iche iche e biputara ebiputa nwetasia
nwanchocha lebakwara anya n’ihe gbasara usoro nchocha e mere bu
ebe o noro wee rutu aka n’ihe e banyere udidi nchocha ebe ndi a
noro mee chocha, ndi e jiri mee nchocha, nsere na usoro nsere
nchocha, ngwa oru di iche iche e jiri mee nchocha. E tuchara ihe
niile a choputara banyere olundi Achi ma tulerikota ya na Igbo
Izugbe. Nwanchocha mechara chikota ihe niile o mere na nchocha a,
tunyekwuo aro eti a ga-esi site n’ileba anya n’olundi di iche iche e
nwere n’asusu Igbo mee ka asusu Igbo were onodu ua dike asusu
tozuru etozu.
7
NDINA
Isokwu — — — — — — — — — i
Ndi Nnabata — — — — — — — — ii
Nhunye — — —- — — — — — — iii
Nkwupu — — — — — — — — — iv
Umi Edemede — — — — — — — — v
Ndina — — — — — — — — — vi
ISI NKE MBU
1.0 Okwu Mmalite — — — — — — —
1.1 Mgbakwasa Isiokwu — — — — — —
1.2 Nsogbu Nchocha — — — — — —
1.3 Ebumnuche Nchocha — — — — — —
1.4 Uru Nchocha — — — — — — —
1.5 Okere Nchocha — — — — — — —
1.6 Ajuju Nchocha — — — — — — —
ISI NKE ABUO
8
2.0 Nnyocha ihe ederela gbasara isiokwu — — —
2.1 Atutu Nnyocha ihe ederela gbasara Isiokwu — —
2.2 Nnyocha Edemede Nchoputaga — — — —
ISI NKE ATO
3.0 Usoro Nchocha — — — — — — —
3.1 Udidi Nchocha — — — — — — —
3.2 Ebe Nchocha — — — — — — —
3.3 Ndi E jiri mee Nchocha — — — — — —
3.4 Nsere na Usoro Nsere — — — — — —
3.5 Ngwaoru Nchocha — — — — — —
3.6 Usoro Nziputa Nchota — — — — — —
ISI NKE ANO
4.0 Ntucha Nchoputa — — — — — — —
4.1 Ntulerikota Udaume di n’olundi Achi na nke Igbo
Izugbe — — — — — — — —
4.2 Ntulerikota Ngbochiume, Udidiudasusu usoro
Mkpoputa di n’olundi Achi na nke Igbo Izugbe — —
9
4.3 Ntulerikota Udaolu n’olundi Achi na Igbo Izugbe —
4.4 Ntulerikota olilo udaume na ndapu mgbochiume n’olundi Achi
na Igbo Izugbe — — — — — — —
ISI NKE ISE
5.0 Nchikota na MMechi — — — — — —
5.1 Nchikota — — — — — — — —
5.2 Aro Nwanchocha — — — — — — —
5.3 Mmechi — — — — — — — —
EDEMSIBIA — — — — — — — —
MGBAKWUNYE — — — — — — — —
10
ISI NKE MBU
1.0 OKWU MMALITE
N’elu uwa dum mmadu bi, obodo obula nwere olundi e ji mara
ya. O bu nihi nke a ka eji esite n’asusu mmadu mara obodo onye
ahu si. Asusu bu ihe mmadu ji akowaputa echiche ya, o bukwa
asusu ka mmadu na ibe ya ji enwe mmekorita nke ikwurita okwu.
Anumanu enweghi asusu, o bu naani mmadu bu anu nwere asusu
puru iche o ji enwe mmekorita n’etiti ya na ibe ya.
Crystal (1971) kowara asusu dika udaolu mmadu a haziri ahazi
n’udi nke na-abughi ebumputa uwa mmadu n’onwe ya mebere e ji
akowaputa echiche site n’okwu onu ma obu ederede. Nkowa nke a
gosiputara na o bu mkpa mmadu nwere ime ka a mara ihe o bu n’obi
kpalitere asusu. Nchoputa a choputara gosiri na e nwere ihe kariri
nari asusu abuo na iri ise n’ime obodo anyi bu Naijiria. Asusu ndi
putakariri ihe bu Igbo, Hausa na Yoruba. Asusu na-enwe olumba na
olu onye nke a bu out njirimara asusu. Asusu Igbo nwere otutu
11
olumba mejuputara ya nke ndi okammuta ufodu dika Ikekonwu
(1985) kwuru na ekeree ya uzo isii, ka e si asu ya na obodo ebe naasu
ya gunyere;
1. Igbo ndi owuwa anyanwu Naija
2. Igbo ndi odida anyanwu Naija
3. Olundi mgbago ugwu
4. Igbo Nnon’etiti
5. Igbo Cross River
6. Olundi Ohaji/Eghema
Igbo Izugbe, dika e si ahuta ya; Anozie (1999) kwuru na e nwere
ike iwere otu asusu kwuuru onwe ya maobu otu n’ime olumba
mebere asusu obula jiri ya mebe Igbo Izugbe. Ihe di mkpa bu ileba
anya were asusu maobu olundi nke mmadu niile nwere nmasi nay a
jiri ya mere asusu izugbe. Nkowa nke a gosiri na o bu site n’olundi di
iche iche ka e si achikoba ya. Nke a gosiri n o bu ihe di ezigbo mkpa
ileba anya n’olu ndi iche iche iche mebere asusu Igbo ka wee site na
ha mee ka asusu Igbo na-eto eto etu okwesiri. O bu nkw a so n’ihe
12
kpaliri mmuo nwanchocha ime nchocha banyere olundi obodo ya bu
Achi site n’itulerikota ya na Igbo Izugbe.
1.1 MGBAKWASA ISIOKWU
Asusu Igbo bu otu n’ime asusu ato kacha puta ihe na Naijiria ma
burukwa otu n’ime asusu e ji eme nchocha n’ogo di elu. Nihi ya ka o
ji di ezigbo mkpa ileba anya n’isi okwu nchocha a bu Nkulerikota
olundi Achi na Igbo Izugbe.
Otutu mgbanwe adila n’ebe asusu Igbo di nihi obibia nke uka
na agumakwukwo nke ndi ocha biara n’ala Igbo wetara. O bu ihe
doro anya na asusu bu otu n’ime omenala e ji amata agburu obula,
mana a bia n’obodo anyi bu Naijiria taa, a ga-achoputa na oke
agumakwukwo na mmepe di iche iche e meela ka agburu ufodu
tumadu agburu Igbo na-eleda asusu ha anya ma nwee oke mmasi
n’iwelite asusu agburu ndi ozo okasi asusu Bekee. O bughi naani na
Igbo Izugbe na-alaghachi azu, kama nke jogburu onwe ya bu na
mperimpe asusu di iche iche olundi mejuputara Igbo Izugbe naanwuzi
anwu. Ekele diri otu iwelite asusu na omenala ndi Igbo
13
(SPILC) bu otu gbadosiri ukwu ike n’ala si na asusu Igbo agaghi ada
n’ala ma obu nwuo anwu.
Emenchocha a gbodoro ukwu na mkpu ndi huru asusu Igbo
n’anya, na’eti wee leba anya n’olu ndi Achi ka otu n’ime olundi di iche
iche mejuputara Igbo izugbe iji chetara umu Igbo na o ga-abu
nnukwu ihe nwute ma a hapu asusu Igbo ka nwuo pii. Olundi obula
bu onyinye puru iche Chineke nyere ha iji nwee mmekorita n’etiti ha
na ibe ha, o buy a mere nwanchocha jiri huta ya dika ihe bara uru
ma dikwa oke mkpa ileba any n’olundi obodo ya.
1.2 NSOGBU NCHOCHA
O nwere nsogbu di iche iche a choputara n’emenchocha a.
nwanchocha choputara na otutu ndi Achi anaghizi enwe mmasi n’isu
asusu Achi. Otutu n’ime ha amaghi ka e si asu asusu ahu ma ncha,
nihi oke apumije na mmepe. Nke a mere ka asusu Achi na-alaghachi
azu.
Nsogbu ozo bun a mgbanwe di iche iche na-abata
n’agumakwukwo nke mere na a na-ele onye a maghi asu asusu
14
Bekee dika onye amaghi akwukwo, nke a mere ka nne na nna bu ndi
kwesiri iji olundi zulite umu ha na-agba nnukwu mbo iji asusu Bekee
wee tooro umu ha nto ala asusu ngwa ngwa ha malitere ikwu okwu.
Onodu a nyere nsogbu nke ukwu maka na o na-eme ka asusu Achi di
ka asusu na-abaghi I’ihe.
Nsogbu ozo enwere bu n’ichota ndi okenye maara maka asusu
Achi nkeoma. Otutu n’ime ndi okenye anwuola, ndi foduru afodu,
nghota anaghi adizi n’okwu ha nihi na ha akaala nka nka ukwu. Ozo
bun a ngwakorita olu ndi Achi na olundi ndi ozo ha na ha gbara
agbata obi, nke a mere ka ndi nke kana asu asusu Achi ghara idi naasu
asusu ahu kpomkwem.
Nke ozo bun a e nweghi akwukwo e dere banyere olundi di iche
iche e nwere n’asusu Igbo tinyekwara na asusu bu ihe omimi ma
sikwaa ike na ntule nke mere na e mebeghi otutu nchocha banyere
olumba Achi.
Nsogbu ozo bun a ihere na-eme umu akwukwo obuladi ndi
nkuzi bu ndi Achi iziputa ihe ha bu n’obi mgbe ha na-aza ajuju a juru
15
ha. Ufodu ndi a gbara ajuju onu eweputachaghi ihe a turu anya n’ihi
na ihere isuputa olundi Achi na-eme ha.
1.3 EBUMNUCHE NCHOCHA
O na-enwe ihe mmadu bu n’uche mgbe obula o na-amalite ime
ihe; nihi ya nwanchocha nwere ihe kpaliri mmuo ya ime nchocha
n’isiokwu a bu Ntulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe. Nwanchocha
choputara na e mebeghi nchocha n’olundi Achi n’uzo putara ihe nke
oma. O bu ya mere na ihe mbu bu ebumnobi nchocha a bu ileba
anya n’olundi Achi. Ebumnobi na-aga esite n’udi nchocha a wee mee
ka nwa afo Igbo obula, tumadu ndi Achi mara na olundi ha bu
onyinye amara Chukwu nyere ha nke kwesiri ka ha jidesie ike.
Ebumnobi ozo e jiri mee nchocha a bu ka e site nay a nye aka
iwelite asusu na omenala Igbo maka na o bu ihe ifufe isi na ndi Igbo
na-ahapuzi ihe a kuru na-agba ihe ozo n’ihe gbasara isu asusu ha. O
bughi naani na nwanchocha choro isite na nchocha nke a mee ka a
mata ileda asusu Igbo anya ma sitekwa n’uzo di otu a welite asusu
Igbo site n’ituputa ihe ndi di mkpa n’olundi Achi ga-enyere Igbo
16
izugbe aka iji na-eto eto.
1.4 URU NCHOCHA
A bara n’ime nchocha a nke isiokwu ya bu Ntulerikota olundi
Achi na Igbo Izugbe. Nihi olile anya e nwere na o ga-abara
ohanaeze uru. Ufodu n’ime uru ndia bu na –
1. O ga-enyere umuakwukwo na-amu maka asusu aka ighota ihe
bu olundi na Igbo izugbe na imata myiri na ndiche din a ha.
2. Ndi nkuzi ga-eritekwa uru na nchocha a nihi na o ga-eme ka
mmuta ha nwere bawanye uba n’ebe olundi na Igbo izugbe di.
3. Ihe mmuta sitere na nchocha a ga-emekwa ka oha na eze
tumadu ndi Achi ghota na asusu ha bara uru ma burukwa nke
na-ekwesighi ka o na-eme ha ihere.
4. Nchocha a bara uru nye ndi ozo ga-eme nchocha n’udi isiokwu
a n’odinihu.
5. Nchocha a ga-eme ndi mmadu ghota na asusu bu ihe di mkpa
ma burukwa ihe kwesiri ka e chekwaa ka ogbo ndi na-eso
na’azu wee nwee mmasi ijidesi ya ike.
17
1.5 OKERE NCHOCHA
O bu eziokwu na olundi Igbo abughi otu ma o bu otu ihe ka ha na
ekwu. N’edemede nchocha a, a ga-eleba anya n’ihe banyere olundi
Achi na ntulerikota ya na Igbo izugbe. Ihe ozo a ga-eleba anya bu
bu usoro odidiudasusu mkpurudasusu, usoromkpoputa na-abata
n’olundi Achi nke puru iche n’igbo izugbe.
AJUJU NCHOCHA
1. E nwere mmetuta n’etiti olundi Achi na nke Igbo Izugbe?
2. E nwere myiri ma obu ndiche n’etiti mkpurudasusu Achi na
nke Igbo Izugbe?
3. Olee ihe mere mkpoputa mkpurudaasusu ndi Achi ufodu na
nke Igbo Izugbe jiri di iche?
4. Olee ebe usorodidiudaasusu Achi na nke Igbo Izugbe yiri na
ebe ha di iche?
5. Gini mere asusu ndi Achi ji enye otutu ndi ntorobia nsogbu
osusu?
6. O nwere mgbochiume di n’olundi Achi nke na-adighi n’Igbo
Izugbe?
7. Olee ntuputa olundi Achi mere ga-abara Igbo Izugbe uru?

DOWNLOAD THE FULL WORK

DISCLAIMER: All project works, files and documents posted on this website, UniProjectTopics.com are the property/copyright of their respective owners. They are for research reference/guidance purposes only and some of the works may be crowd-sourced. Please don’t submit someone’s work as your own to avoid plagiarism and its consequences. Use it as a reference/citation/guidance purpose only and not copy the work word for word (verbatim). The paper should be used as a guide or framework for your own paper. The contents of this paper should be able to help you in generating new ideas and thoughts for your own study. UniProjectTopics.com is a repository of research works where works are uploaded for research guidance. Our aim of providing this work is to help you eradicate the stress of going from one school library to another in search of research materials. This is a legal service because all tertiary institutions permit their students to read previous works, projects, books, articles, journals or papers while developing their own works. This is where the need for literature review comes in. “What a good artist understands is that nothing comes from nowhere. All creative work builds on what came before. Nothing is completely original.” - Austin Kleon. The paid subscription on UniProjectTopics.com is a means by which the website is maintained to support Open Education. If you see your work posted here by any means, and you want it to be removed/credited, please contact us with the web address link to the work. We will reply to and honour every request. Please notice it may take up to 24 – 48 hours to process your request.

WeCreativez WhatsApp Support
Administrator (Online)
I am online and ready to help you via WhatsApp chat. Let me know if you need my assistance.